Anyị n’asụ ala ubi,
Kọọ ji ọma na ya,
Ma Chineke ji aka-Ya
Neme ka ha netọ.
Ọ nyere mir’ozuzọ
K’ome-ji w’epụte;
Anyanwu n’igirigi,
Nenye anyị nri n’uba.


Kọrọs:
Onyiny’ọma nile
Ha dum si n’elu bia;
Kele Chineke, kele Chineke
N’ihu-n’anya-Ya! Amen.


Ọ bụ nanị Ya kere
Ihe nile n’uwa:
Okoko netọ n’ohia,
Kpakpando nk’anyasị.
Ifufe nan’olu-Ya,
Ya neny’nnunu nri;
Nke ka, Ọ neny’umu-Ya
Nri-ha kwa-ubọchi.


Nna, anyị neny’Ekele
N’ihi ih’ọma dum:
Mgb’igha-mkpuru n’owuwe,
Ndu, nri, n’arụ-ike.
Nar’onyinye anyị chere
N’ih’ihu-n’anya-Gi;
N’ihe natọ Gi karị:
Obi-ekele-anyị.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *